Take a fresh look at your lifestyle.

Okwu dara uda na akwukwo nta akuko ubochi uka

398

Get real time updates directly on you device, subscribe now.

Okwu dara uda na akwukwo nta akuko ubochi uka bu abali asato na onwa iri na otu na afo puku iri abuo na iri abuo

Genu nti ka unu nu ihe gbara okpuru na akwukwo mgbasa ozi. Onye wetara unu nke a bu iwuoha prince

NATION NEWSPAPER

Mazi Biden Joe emeriela Mazi Trump Donald wee buru onye isi ochichi obodo Amirika

Ndi Ochichi obodo Naijiria achoghi ige nti na ihe otu jikoro ndi nkuzi mahadum na ekwu

Mazi Nwankwo ekwuola na otu ndorondoro ochichi APC enweghi ike obula na obodo Anambra

Ogbaghara otu APC na aka njo na obodo Kwara stetii

Ndi Ezi na ulo oti egwu aha ya bu Orlando Owo na eme ncheta onwu ya

Otu FIRM eweputala ndi ga achi ha

Ulo olu na akwughachi ndi ihe ha mebiri ( insurance firms) enweghi ego ikwughachi ndi emebiri ihe ha na ogbaghara emere na Naijiria nille

VANGUARD

Donald Trump esorola na ndi chiri Amirika naani otu mgbe

Otu ndi Middle Belt agwala ndi ochichi Naijiria ka ha na ndi nkuzi mahadun mee udo

Fasola buru onye isi obodo lagos ekwela nkwa na ndi ochichi Naijiria ga akwado nmepe obodo niile dina Naijiria

Ndi nche emela ka amara ihe mere izu ohi ji na aga na ihu na obodo zamfara

Ndi ahuike ekwuputala na oria malaria adighi nma na ahu umu nwaayi di ime

Ndi na achi obodo Naijiria ebidola ileba anya na ugwo onwa ndi uwe ojii

Ukochukwu Anglikan agwala ndi ochichi Naijiria ka ha gbasie mbo ike ichekwa ndu ndi Naijiria

Onye isi ala Naijiria bu Buhari ekelela onye isi ala ohuru Amirika bu Joe Biden na nmeri omeriri Mazi Trump

LASEMA okwuola na otutu ulo ga ada na ala na obodo lagos

Ndi ezi na ulo ndi uwe oji egburu na njeghari iwe ebidola iriju ha

Ihe mberede ugbo ala mere na obodo osun gburu otu mmadu.merukwa mmadu ano ahu

THISDAY

Onye na achi obodo Naijiria bu buhari ka na achokwa ibiri ego na aka ndi bekee

Ihe mere ndi kwesiri ikwubata ego na akpa Naijiria akwubatabeghi ego

Oge irughari na idozi obodo Naijiria erula

Otu egwuru egwu Chelsea meriri otu Sheffield

Onye ndu ohuru obodo Amirika bu Mazi Biden ekwela nkwa ibu ezigbo onye ndu

Ndi na achi uwa niile ekelela Mazi Biden

Otu na ahu maka ule aha ha bu WAEC emela ka ubochi idebata aha ndi choro ile ule tee anya

PUNCH

Onye oti egwu aha ya bu pasuma ekwuola ka osi nyere ndi mmadu aka oge COVID19

Ulo uka ukochukwu aha ya bu Tunde Bakare bu okacha nma

Ndi okachamara na okwu nri ekwuola na umu aka no afo ise kwesiri iri ezigbo nri

Onye oji ego acho ego aha ya bu Tony Elumele ekelela Lolo Ndi Okereke Onyuke na ncheta afo iri asaa ya

Ulo olu na ahu maka ebe ana agu akwukwo ekwuola na otutu ebe ana agu akwukwo ka bukwa nkponkpo ebe na agbanyeghi nnukwu ego eweputara maka ha

Okanmuta Tella etiela mkpu na onwere ndi Naijiria na eri ego Naijiria bitere na aka ndi ocha

Nwunye onye uwe oji egburu oge ogba aghara sirina ona acho iji aka ya gbuo onwe ya

Otu ndi okpe ikpe na Naijiria na ewesi ndi ochichi Naijiria iwe maka igbu ndi na eme njeghari iwe

Anumanu ka mmadu ike egbuola mmadu abuo na obodo Aljiria

Otu ndi dibia bekee Naijiria akpola oku ka eleba anya na ihe ojo mere na ulo ogwu Rivers steeti

Onye isi uwe ojii Naijiria enyela iwu ka ewepu ndi uwe oji na eso ufodu mmadu agaghari

Ezenwaanyi bu Ngozi Okonjo Iweala agwala ndi ochichi Naijiria ka ha kwuwa aka ha oto

Ndi ochongaloko ejidela mmadu iri na isii na obodo Ondo

Ndi ulo olu oriri na nkwari na ebe akwa ego kemgbe oria coronavirus mere ha njo ahia

Oriaku Okonjo Iweala eweputala uzo isii obodo Naijiria ga esi akpata ego

THE SUN NEWSPAPER

Onye isi uwe oji Naijiria ehiwela ogbako ga agbako ihe ojo mere ndi uwe oji na ogba aghara enwere na Naijiria

Kpoo m na akara +2348138460701.

Get real time updates directly on you device, subscribe now.