Okwu dara uda na akwukwo nta akuko ubochi uka
Okwu dara uda na akwukwo nta akuko ubochi uka bu abali asato na onwa iri na otu na afo puku iri abuo na iri abuo
Genu nti ka unu nu ihe gbara okpuru na akwukwo mgbasa ozi. Onye wetara unu nke a bu iwuoha prince
NATION NEWSPAPER
Mazi Biden Joe emeriela Mazi Trump Donald wee buru onye isi ochichi obodo Amirika
Ndi Ochichi obodo Naijiria achoghi ige nti na ihe otu jikoro ndi nkuzi mahadum na ekwu
Mazi Nwankwo ekwuola na otu ndorondoro ochichi APC enweghi ike obula na obodo Anambra
Ogbaghara otu APC na aka njo na obodo Kwara stetii
Ndi Ezi na ulo oti egwu aha ya bu Orlando Owo na eme ncheta onwu ya
Otu FIRM eweputala ndi ga achi ha
Ulo olu na akwughachi ndi ihe ha mebiri ( insurance firms) enweghi ego ikwughachi ndi emebiri ihe ha na ogbaghara emere na Naijiria nille
VANGUARD
Donald Trump esorola na ndi chiri Amirika naani otu mgbe
Otu ndi Middle Belt agwala ndi ochichi Naijiria ka ha na ndi nkuzi mahadun mee udo
Fasola buru onye isi obodo lagos ekwela nkwa na ndi ochichi Naijiria ga akwado nmepe obodo niile dina Naijiria
Ndi nche emela ka amara ihe mere izu ohi ji na aga na ihu na obodo zamfara
Ndi ahuike ekwuputala na oria malaria adighi nma na ahu umu nwaayi di ime
Ndi na achi obodo Naijiria ebidola ileba anya na ugwo onwa ndi uwe ojii
Ukochukwu Anglikan agwala ndi ochichi Naijiria ka ha gbasie mbo ike ichekwa ndu ndi Naijiria
Onye isi ala Naijiria bu Buhari ekelela onye isi ala ohuru Amirika bu Joe Biden na nmeri omeriri Mazi Trump
LASEMA okwuola na otutu ulo ga ada na ala na obodo lagos
Ndi ezi na ulo ndi uwe oji egburu na njeghari iwe ebidola iriju ha
Ihe mberede ugbo ala mere na obodo osun gburu otu mmadu.merukwa mmadu ano ahu
THISDAY
Onye na achi obodo Naijiria bu buhari ka na achokwa ibiri ego na aka ndi bekee
Ihe mere ndi kwesiri ikwubata ego na akpa Naijiria akwubatabeghi ego
Oge irughari na idozi obodo Naijiria erula
Otu egwuru egwu Chelsea meriri otu Sheffield
Onye ndu ohuru obodo Amirika bu Mazi Biden ekwela nkwa ibu ezigbo onye ndu
Ndi na achi uwa niile ekelela Mazi Biden
Otu na ahu maka ule aha ha bu WAEC emela ka ubochi idebata aha ndi choro ile ule tee anya
PUNCH
Onye oti egwu aha ya bu pasuma ekwuola ka osi nyere ndi mmadu aka oge COVID19
Ulo uka ukochukwu aha ya bu Tunde Bakare bu okacha nma
Ndi okachamara na okwu nri ekwuola na umu aka no afo ise kwesiri iri ezigbo nri
Onye oji ego acho ego aha ya bu Tony Elumele ekelela Lolo Ndi Okereke Onyuke na ncheta afo iri asaa ya
Ulo olu na ahu maka ebe ana agu akwukwo ekwuola na otutu ebe ana agu akwukwo ka bukwa nkponkpo ebe na agbanyeghi nnukwu ego eweputara maka ha
Okanmuta Tella etiela mkpu na onwere ndi Naijiria na eri ego Naijiria bitere na aka ndi ocha
Nwunye onye uwe oji egburu oge ogba aghara sirina ona acho iji aka ya gbuo onwe ya
Otu ndi okpe ikpe na Naijiria na ewesi ndi ochichi Naijiria iwe maka igbu ndi na eme njeghari iwe
Anumanu ka mmadu ike egbuola mmadu abuo na obodo Aljiria
Otu ndi dibia bekee Naijiria akpola oku ka eleba anya na ihe ojo mere na ulo ogwu Rivers steeti
Onye isi uwe ojii Naijiria enyela iwu ka ewepu ndi uwe oji na eso ufodu mmadu agaghari
Ezenwaanyi bu Ngozi Okonjo Iweala agwala ndi ochichi Naijiria ka ha kwuwa aka ha oto
Ndi ochongaloko ejidela mmadu iri na isii na obodo Ondo
Ndi ulo olu oriri na nkwari na ebe akwa ego kemgbe oria coronavirus mere ha njo ahia
Oriaku Okonjo Iweala eweputala uzo isii obodo Naijiria ga esi akpata ego
THE SUN NEWSPAPER
Onye isi uwe oji Naijiria ehiwela ogbako ga agbako ihe ojo mere ndi uwe oji na ogba aghara enwere na Naijiria
Kpoo m na akara +2348138460701.