Take a fresh look at your lifestyle.

Ndigbo na anumanu

400

Get real time updates directly on you device, subscribe now.

Ndigbo na eji anụmanụ na akọwa omume ndi mmadụ. Igbo ma ka esi eji anụ ọhịa na anụ ụlọ kowa otu mmadụ si akpa agwa

Ge ntị ka ịnụ anụmanụ Igbo ji akọwa mmadụ

Ézì :, igbo na eji ezi akọwa mmadụ na eru unyi. Asina mmadụ bụ ezi, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ anaghị adị ọcha. Ọ pụtara na ụlọ onye ahụ bi na ime ya ruru unyi..

Ézì abụghị naanị anụ ụlọ ahụ nọ anyị nsọ, Ézì bụ mmadụ na adịghị asa akwa ya mmiri, onye na adịghị asa efere ọjị eri nri mmiri, onye adịghị akwụ aka mgbe ọ chọrọ ibido iri nri na oge orichara nri

Oké : Igbo ji oké na akọwa onye na ezu ohi. Ókè bụ anụ ụlọ na eri ihe o kwesịghị iri na ụlọ. Oke na eri azụ dị na ngiga mere Igbo jiri tụọ ilu na ọbụ oké nọ na ụlọ gwara oké nọ na ohia na azụ dina ngiga

Onye na ewere ihe abụghị nke ya bụ oké. Onye na aba na ụlọ onye ọzọ, zuru ihe edotere ebe ahụ bụ oké.
Onye na aba na ubi, /ugbo onye ọzọ zuru ihe akụrụ na ugbo bụ oke
Nwa akwụkwọ na ezuru akwụkwọ nwa akwụkwọ ibe ya bụ oké

Ukochukwu na eri ego ndị ụlọ ụka bụ oké.
Agwọ : agwọ bụ anụ ọhịa toro ogologo dịkwa njọ. O nweghị anụ ọhịa mmadụ kpọrọ asị ka agwọ. Ogwo bata na ụlọ, mmadụ niile agaghị ezu ike rue mgbe ha gburu ya.

Agwọ na ata mmadụ, nnukwu agwọ nke ana akpọ eke na elo mmadụ
Igbo ji agwọ na akọwa onye dị njọ nke ukwu.
Akpọ mmadụ agwọ, ọ pụtara na onye ahụ dị egwu

Mbe/ mbekwu: nke a bụ obere anụ ọhịa na aga nwayọ nwayọ. Mbe adịghị eme si ihe ike. Mbe adịghị ike ọgụ ma ọbụ ike mgba Mbe anaghị ari elu. Ụkwụ mbe bere mpe
Mbe adịghị ike ma ọjị aghụghọ na emeri anụ ka ya ike

Nke a mere Igbo ji tụọ ilu sina agwọ tụrụ mbe, tụrụ okpokoro

Mbe enweghị ike ịlusị agwọ ọgụ. Na agbanyeghị ka agwọ si sie ike, o nweghị ike igbu mbe n’ihi mbe ga abanye na okpokoro ya ngwa ngwa agwọ na erute ya nso

Akụkọ ife niile eji mbe na akọ bụ maka aghụghọ mbe.
Unu chetara akụkọ UNU DUM?
Ọbụrụ na ị maghị akụkọ a, m ga akọrọ unu ya echi
.
Agu: agụ bu anụmanụ sịrị ike nke ukwuu. Ya mere Igbo ji asị Agu bata mgbada agbawa ọsọ

Igbo ji agụ na akọwa mmadụ sịrị ajoo ike Asina mmadụ bụ agụ, ọ pụtaghị na onye ahụ bina ime ọhịa.
Ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ nwere ụmụ ilu ọgụ na ilu olu
Ndị mmadụ na aza agụ dịka ezigbo aha ha. Enwere ọtụtụ ezi na ụlọ Igbo aha ha bụ agu

Adoghi agụ ndị chịrị echichi agụ ọnụ.
Agu na eche mba
Agu na eche obodo
Agu no na ulo
Ome ka agu

Ọbụ nnukwu ihe mmadụ ịchị echichi agu. Ha na akpa nganga oge akpọrọ ha agụ ma na ewe iwe mgbe akpọrọ ha anụ ọhịa dịka aga asina agụ abụghị anụ ohia

Ugo: ugo bụ eze ụmụ nnunnu nile. ugo bụ nnunnu pụrụ iche. Ugo mara nna di egwu. Anaghị ahụ ugo anya mgbe niile. Orara ahụ bụ mmadụ ihu ugo.
Ọtụtụ mmadụ na aza ugo dịka aha ha.
Ugochukwu
Ugonma
Ugonna
Ugochi

Ndị na aza ugo ji aha ha eme nganga ma na ewe iwe mgbe ịkpọrọ ha nnunnu dịka aga asina ugo abughikwa nnunnu

Akara ugo bụ nnukwu ihe ana enye mmadụ mgbe o mere ihe ike
Akara ugo bụ award, laurel, honor
Ụfọdụ mmadụ ndị nne na nna ha agoghi ha ugo dịka aha ha na echi ugo dịka echichi
Ugo mba I
Ugo abata 11
Ugo oha111

Ugo pụrụ iche rue na Ọbụrụ na mmadụ ma nma na eme ihe ọjọọ Igbo na akpọ ya

Ugo mara nma na eri awo
Égbè : egbe bụ nnunnu jụrụ ebe niile. Adịghị achọ egbe achọ. Egbe na efegharị na obodo na ime ohia
Egbe na eri ọkụkọ. Ikpo mmadụ egbe pụtara na onye ahụ anaghị anọ otu ebe.. Igbo jiri egbe na ugo tụọ ilu sina

Egbe bere ugo bere nke si ibe ya ebela, nku kwaa ya

Ewu / Atụrụ.: anụ abụọ a na ebi na ụlọ mmadụ. Ha na mmadụ dị na nma n’ihi ha adịghị egbu mmadụ ma ọbụ merụọ mmadụ ahụ.
N’ihi na ha adịghị emerụ mmadụ ahụ mere Igbo ji ha akọwa mmadụ dị nzuzu. Ikpo mmadụ ewu pụtara na onye ahụ bụ onye iberibe
Ikpo mmadụ atụrụ pụtara na onye ahụ amaghị ihe. Ewu na ebe ákwá na ebe nmeeeee nmeeeee

N’ihi nke a. ana asị na mmadụ amaghị ihe bụ nmeeeee
Akpọ gị nmeeeee, ọ pụtara na o nweghị ihe ima
Nkita: nkịta bụ otu na ime anụ ụlọ bara nnukwu uru. Nkịta na echebe ụlọ site na igbo uja.
Nkita na eso dịnta baa ime ọhịa ma chupụta kwara ya anụ ọhịa dị iche iche
Na ihe ọma niile a nkịta na eme, ihe Igbo ji mara nkịta bụ ịkwa iko.
Ikpo mmadụ nkịta pụtara na onye ahụ na ákwà iko dị egwu. Onye akpọrọ nkịta dịka ikpo ya onye akwula

Udele: udeke bụ nnunnu bụrụ ibu. Udele na eri anụ nwụrụ anwụ. Udele anaghị egbu anụ ibe ya. Udele na nwe ndidi ka anụ nwuora onwe ya tupu orie ozu ya
Ọbụ nkea mere Igbo jiri tụọ ilu sina

Achucha àjà ma ahụghị Udele, ihe mere ebe ndị mmụọ
Igbo ji Udele akọwa mmadụ ruru arụ. Mmadụ na enweghị omume dị nma
Igbo ji Udele akọwa ọnọdụ jọrọ ajoo njọ. L
Ihe ịma atụ bu

Onodo Naijiria jụrụ njọ ka Udele na esi ka nkapi/ nkakwu
Ọbụrụ na mmadụ ajoo njọ na ese okwu, igbo na asina onye ahụ dịka Udele mmiri mara

Kpo Iwuoha prince na akara ìgwè a ma Ọbụrụ na ịchọrọ iso na ụlọ akwụkwọ anyi

Dịka Iwuoha prince dere ya
±2348138460701

Get real time updates directly on you device, subscribe now.