Ilu m chọrọ ituru ụmụ Igbo – site n’aka Iwuoha Prince
#IgboProverbs
Iwu Igbo Iwuoha prince na e wetara unu
Ike anaghị agwụ ụmụ Igbo na ịtụ ilu, dịka anyị na atụ ilu bụ ka agụụ ịtụ ilu na agụ anyị. Anyị na eri ilu Igbo dịka nri. Dịka akpịrị na akpọ nne ele nkụ mgbe anụghị mmiri, otu a ka akpịrị na akpọ m nkụ, mgbe m itubeghi ilu Igbo
Taa, ilu m chọrọ ituru ụmụ Igbo bu:
Onye buru chi ya uzo, ọgbagbuo onwe ya na oso
Na ala Igbo, anyị nwere onye ukwu bina eluigwe nke anyị na akpọ Chineke ma ọbụ Chukwu
Anyị ahubeghi nwoke a anya, ma anyị kwere na ọdi. Anyị kwere na ọ pụrụ ime ihe niile, lgbo kwere na ọbụ Chineke kere ụwa. Igbo kwesịrị ike na Chineke karịrị mmadụ niile
Na aka nke ọzọ, mmadụ nwere ike ịbụ chi ibe ya n’ihi ọbụ na aka mmadụ ka Chineke sina emere mmadụ ihe.
Chineke adịghị esi na eluigwe rịdata na ụwa bia mere mmadụ ihe
Nke a mere na mmadụ nwere ike ịbụ Chineke ibe ya
Nke a mere Igbo ji atụ ilu sina
Onye kariri mmadụ, kariri chi ya
Nkọwa ilu Onye buru chi ya uzo ọgba gbuo onwe ya na ọsọ putara na onye leliri onye ka ya anya nwere ike inwe nsogbu
Ilu a na akọwa na ọ dịghị nma ka mmadụ ọbụla lelia onye ka ya anya
Nwunye ekwesịghị ileli dị ya anya
Nwa ekwesịghị ileli nne na nna ya anya
Nwa akwụkwọ adịghị nma ileli onye nkụzi anya
Nwa odubo, adịghị nma ileli nna ya ukwu anya
Ihe a bụ ilu Igbo ji akuzi uru irube isi bara, mkpa ọdi bụ isopuru onye ka anyi
Ibu onye na akpari onye tọrọ gị? Biko mụta ihe na ilu a. Ibu onye na enupu isi,? Biko mụta ihe na ilu a
Ọbụrụ na ịchọrọ iso na ụlọ akwụkwọ Igbo anyị.
Biko kpo Iwuoha prince na akara ±2348138460701
Princeiwuoha16@gmail. com
#IgboProverbs