Na ala Igbo, anyị nwere afọ, nkwo, orie na eke. Ụbọchị ọzọ pụrụ iche bụ abalị anọ na onwa iri na otu.
Oké ụbọchị a na abịa naanị otu mgbe na afo. Ihe mere ụbọchị a ji bụrụ akacha nma bụ maka na ọbụ ụbọchị amuru nwa Igbo na enweghị o yiri. Obu ụbọchị amuru onye nzọpụta ndigbo.
Kedụ odogwu a bụ onye nzọpụta Igbo niile? Ọbụ Dim Chukwuemeka Odumegwu Nwa Ojukwu. Ojukwu ụwa niile, Ojukwu Igbo gburugburu. Ojukwu dị ebube Ojukwu okaome, Ojukwu dike.
Ọbụ ezi okwu na Igbo enweghị eze, ma Chukwuemeka sitere na ezi omume ya bụrụ eze ndigbo
Ojukwu bụrụ ndigbo ihe Moses bụrụ ụmụ Isreal. Ojukwu ji ndụ ya chụọ àjà dịka Jizọs ji ndụ chụọ àjà na kalvary
Ọbụ ihe ọjọọ, ihe ihere na ụmụ Isreal ka na echeta Moses ebe ndigbo chefurule Emeka Ojukwu
Kedụ onye ga adịka ikemba Nnewi? O nweghị mmadụ ga adịka Emeka Ojukwu
Emaka bụ agụ amuru ka mmadụ. Emeka bụ ọzọ Igbo ndụ.
Emeka ji akụ na ụba nna ya luora Igbo ọgụ. Emeka ji ama ihe ya chọọ izu pụta Igbo na aka ekwensu
Igbo bụrụ umu Isreal na ezi okwu, anyị kwesịrị ime ka aha Emeka na ewu ewu na ụwa niile
Dịka Igbo na asọpụrụ ọjị bụka Igbo kwesịrị isopụrụ Emeka Ojukwu niihi Emeka bụ ọjị Igbo nwoke
Ndia niile na ekwu okwu biafra kwesịrị ina elere anya na ihe Emeka mèrè ndigbo oge odi ndu
Igbo kwesịrị isopụrụ Emeka Ojukwu dịka ndị Yoruba na akpọ isi ala nye obafemi awolowo
Dịka Igbo ejighị ọfọ na ọgụ egwu egwu bụ ka anyị na ekwesịghị iji Emeka egwu egwu niihi Emeka bụ ọfọ bụkwaara ọgụ ụmụ igbo
Akụkọ Igbo ezughị okè ma ọbụrụ na akpotughi aha Emeka Ojukwu
Emeka Ojukwu mụ bụ iwuoha prince na asị ka mkpụrụ obi gị zuo ike na ala eze
Ọbụrụ na ọnwụ abụghị onye iberibe, o kwesịrị ịma na Emeka Ojukwu adịghị nma ịnwụ anwụ.
Ọbụrụ na ili abụghị onye nzuzu, ili kwesịrị ịma na Emeka Ojukwu adịghị nma ịba na ala ili
Nkasi obi m bụ na ndị nsọ ga ekulite na ọnwụ mgbe opi ike dara, ụbọchị ahụ ka Emeka ụwa niile ga ekulite na ike na ebube
Odi m ka aga asị ka ụbọchị mbilite na ọnwụ bụrụ taa. Ka anyị niile hụ eze anyị Eze CHUKWUEMEKA ODUMEGWU NWA OJUKWU
OJUKWU bu
Okaome na Anambra
Igwe ka ala na Abia
Okaka na Ebonyi
Agụ na eche mba na Imo
Agada gbachiri ụzọ na Enugu
Iwuoha Prince dere ihe a; ±2348138460701.
Comments are closed.