Ibụ onye Igbo? Ilu ole ka ịma?
#IgboProverbs
Ilu Igbo nke taa sitere na ọnụ Iwuoha prince
Ibụ onye Igbo? Ilu ole ka ịma? Ịma na Igbo nwere ilu maka ọnọdụ ọbụla? Ka anyị leba anya na ilu Igbo ji agwa mmadụ ka ọ kwado nke oma tupu obido ime ihe ọ chọrọ ime
Nke mbụ, Okoro etoghi eto, wara ogodo, ikuku fee, Ọbụrụ ya na ogodo ya.
Nke abụọ, agbara aka ná azọ ala, onye ji ji ana akọ
Nke atọ, nwa nta na ejighị egbe na achọ onye gburu nna ya, onye gburu nna ya ga egbu ya
Nke anọ, anaghị agba aka, achụ ihe na ata aru
Nke ise, anaghị agba aka, ahụ nwa nta eze
Nke isii, Onye na aga na nke arụsị na eji ọjị na ọmu nkwu
M ga akowacha ilu ndị a na otu na otu. M ga eji ha niile mee okwu
Ọbụrụ na ịchọrọ iso na ụlọ akwụkwọ anyi.
Kpo Iwuoha prince na akara ìgwè ±2348138460701
#IgboProverbs